Tongues of Poetry (Issue 3)

Tongues of Poetry (Issue 3)

Anụnụebe by Amarachi Attamah

 

Bịa, ị bụdị anụnụebe?

A naghị ekwe onye ọzọ Ibe

I bee, i bechie ebe onye ọzọ ga-ebe

 

Oge ọbụla i na-ede

Na-achọ onye gị na ya ga-ese

Ka a ga asị na gị na udo na-ese

 

Oge ọbụla, asịrị ka i na-ege

Ihe ọma mere onye ọzọ ka i na-ede

Nke na-eme gị, i gbarụọ ihu ka azụ-ite

Dịka a ga-asị na gị na ihe ọma na-ese

 

Ka m jukene gị, i bụdị anụnụebe

Ka anyị marakwa nke anyị na-eze

Adi ama ama aka mmadụ aghọọ aka enwe

 

alaka gị, o nweghị nnụnụ na-ebe

ogwe gi, i naghị ekwe arụrụ ibe

Nke ka njọ bụ na ọ dị ka gị na dịbịa a nazị ese

Ya ka m ji ajụ ma i bụdị anụnụebe

 

Amarachi C. Attamah
CoordinAAator— Tongues of Poetry

(Nwadịọramma)

Writer, Performing poet, Broadcaster.

O’di Egwu by John Chizoba Vincent

O’ di egwu ihe anya na ahu
Odi egwu ihe isi na ebu
Onye ma mgbe oga ala
Onye ma ihe ga egbu ya
Madu ta, ozu echi na abia
Onye na nke ya na uwa oma a
O’di egwu ihe na eme na uwa a
Egbe na achu ego, mbe na achu ego
Madu ka ana aria, onye ma onye oma ya.
O’di egwu ihe anya na ahu
Uwa di egwu na nke ya
Uwa na eme ntuhari
Odikwa egwu.

12741915_975174085905657_7494679368805791299_nJohn Chizoba Vincent hails from Nkporo in Ohafia local government area of Abia state. He is a poet, novelist, and film director. His works have appeared in Poemhunter, Voicesnet, Asaplanet and so many other literary magazines and journals. He has four published works to his credit.

One thought on “Tongues of Poetry (Issue 3)

Leave a Reply